30Zọpụtanụ onwe gị! Si nʼelu obe ahụ rịdata.”
31Ọ bụladị ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu na ndị ode akwụkwọ nọ na-akwa ya emo nʼetiti onwe ha na-asị, “Ọ zọpụtara ndị ọzọ, ma ọ pụghị ịzọpụta onwe ya!
32Ka Kraịst a, bụ Eze Izrel, si nʼelu obe a rịdata ka anyị hụ ma kwerekwa.” Ndị ahụ a kpọgidekọrọ ha na ya nʼobe nọkwa na-akparị ya.
33Mgbe ọ kụrụ elekere iri na abụọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile. Ọchịchịrị a dịgidere ruo nʼelekere atọ nke ehihie.
34Nʼelekere atọ nke ehihie, Jisọs tiri mkpu akwa nʼoke olu sị, “Elọi, Elọi, lama sabaktani!” (nke pụtara, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m?”).