32Ka Kraịst a, bụ Eze Izrel, si nʼelu obe a rịdata ka anyị hụ ma kwerekwa.” Ndị ahụ a kpọgidekọrọ ha na ya nʼobe nọkwa na-akparị ya.
33Mgbe ọ kụrụ elekere iri na abụọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara nʼala ahụ niile. Ọchịchịrị a dịgidere ruo nʼelekere atọ nke ehihie.
34Nʼelekere atọ nke ehihie, Jisọs tiri mkpu akwa nʼoke olu sị, “Elọi, Elọi, lama sabaktani!” (nke pụtara, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m?”).
35Ma ụfọdụ ndị guzo nso nʼebe ahụ, mgbe ha nụrụ nke a, sịrị, “Lee, ọ na-akpọ Ịlaịja!”
36Ya mere, otu onye gbaara ọsọ gaa weta ogbo, denye ya nʼime mmanya gbara ụka, fanye ya na okporo osisi, nye ya ka ọ ṅụọ, ma na-asị, “Hapụnụ ya, ka anyị lee ma Ịlaịja ọ ga-abịa tọtuo ya.”