39Mgbe ọchịagha guzo nʼihu ya, hụrụ otu o si kubie ume, o kwuru sị, “Nʼezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke.”
40O nwere ụfọdụ ụmụ nwanyị guzo nʼebe dị anya na-ele ihe na-eme, nʼetiti ha bụ Meri Magdalin, Meri nne Jemis nke nta, na Josef, na Salomi.
41Ndị a bụ ndị naara eso ya na-ejekwara ya ozi, mgbe ọ nọ na Galili. Ọ dịkwa ndị inyom ọzọ nọkwa nʼebe ahụ, bụ ndị sooro ya bịa na Jerusalem.
42Nʼoge uhuruchi (ya bụ ụbọchị na-abọta ụbọchị izuike), ebe ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe,
43Josef onye Arimatia, otu nʼime ndị otu nʼụlọ nzukọ, onye a na-asọpụrụ, onye na-echere ọbịbịa nke alaeze Chineke, ji obi ike jekwuru Pailet rịọ ya ka o bunye ya ahụ Jisọs.