41Ndị a bụ ndị naara eso ya na-ejekwara ya ozi, mgbe ọ nọ na Galili. Ọ dịkwa ndị inyom ọzọ nọkwa nʼebe ahụ, bụ ndị sooro ya bịa na Jerusalem.
42Nʼoge uhuruchi (ya bụ ụbọchị na-abọta ụbọchị izuike), ebe ọ bụ Ụbọchị Nkwadebe,
43Josef onye Arimatia, otu nʼime ndị otu nʼụlọ nzukọ, onye a na-asọpụrụ, onye na-echere ọbịbịa nke alaeze Chineke, ji obi ike jekwuru Pailet rịọ ya ka o bunye ya ahụ Jisọs.
44Ọ juru Pailet anya ịnụ na ọ nwụọla. Ọ kpọrọ ọchịagha ahụ jụọ ya ma ọ nwụọla.
45Mgbe ọchịagha ahụ gwara ya na ọ nwụọla, o kwere ka Josef buru ahụ ya.