45Mgbe ọchịagha ahụ gwara ya na ọ nwụọla, o kwere ka Josef buru ahụ ya.
46Josef zụtara akwa ọcha linin, wedata ahụ ya jiri akwa ahụ fụchie ya. O buuru ya buba ya nʼime ili nke o gwuru nʼime nkume. Emesịa o nuketara otu nkume buru ibu, jiri ya mechie ọnụ ụzọ ili ahụ.
47Meri Magdalin na Meri nne Josef hụkwara ebe e bubara ahụ ya.