1Mgbe ụbọchị izuike gafere, Meri Magdalin na Meri nne Jemis na Salomi zụtara ụda dị iche iche ha ga-eji tee ahụ ya mmanụ.
2Nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu, mgbe anyanwụ wara, ha biliri gawa nʼili ahụ.
3Ha jụrịtara onwe ha na-asị, “Onye ga-enupuru anyị nkume ahụ dị nʼọnụ ụzọ ili ahụ?”