Mak 16

Mgbe ha nụrụ na ọ dị ndụ, na ọ hụkwala ya, ha ekweghị.

Mark 16:11 (UKJV) And they, when they had heard that he was alive, and had been seen of her, believed not.

9Mgbe Jisọs biliri nʼọnwụ nʼisi ụtụtụ nʼụbọchị mbụ nke izu, onye mbụ o gosiri onwe ya bụ Meri Magdalin, onye ahụ o siri nʼahụ ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa.

10Ọ lara gaa kọrọ ndị ya na ha na-anọ na mbụ, bụ ndị nọrịị na-ebe akwa ma na-erukwa ụjụ.

11Mgbe ha nụrụ na ọ dị ndụ, na ọ hụkwala ya, ha ekweghị.

12Mgbe ihe ndị a gasịrị, o gosiri mmadụ abụọ nʼime ha onwe ya nʼụdị ọzọ, mgbe ha na-abanye nʼime obodo.

13Ndị a laghachiri bịa kọọrọ ndị nke ọzọ ma ha ekwetakwaghị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.