Mak 16

Ndị a laghachiri bịa kọọrọ ndị nke ọzọ ma ha ekwetakwaghị.

Mark 16:13 (UKJV) And they went and told it unto the residue: neither believed they them.

11Mgbe ha nụrụ na ọ dị ndụ, na ọ hụkwala ya, ha ekweghị.

12Mgbe ihe ndị a gasịrị, o gosiri mmadụ abụọ nʼime ha onwe ya nʼụdị ọzọ, mgbe ha na-abanye nʼime obodo.

13Ndị a laghachiri bịa kọọrọ ndị nke ọzọ ma ha ekwetakwaghị.

14Emesịa, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya iri na otu ahụ onwe ya, mgbe ha nọkọrọ na-eri nri. Ọ baara ha mba nʼihi enweghị okwukwe ha nakwa mkpọchi obi ha, nʼihi na ha jụrụ ikwenye nʼihe ndị ọzọ hụrụ ya gwara ha mgbe e mesịrị ka ọ si nʼọnwụ bilite.

15Ọ gwara ha sị, “Gaanụ nʼime ụwa niile kwusaara ihe niile e kere eke oziọma.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.