4Ma mgbe ha leliri anya, ha hụrụ na e nupụla nkume ukwu ahụ.
5Mgbe ha banyere nʼime ili ahụ, ha hụrụ otu nwokorobịa yi uwe ọcha ka ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ aka nri nke ili ahụ. Ha tụrụ oke egwu.
6Ma ọ sịrị ha, “Unu atụla egwu. Unu na-achọ Jisọs onye Nazaret a kpọgidere nʼobe. E meela ka o site nʼọnwụ bilie! Ọ nọkwaghị nʼebe a. Lee ebe e nibere ya.
7Ma gaanụ gwa ndị na-eso ụzọ ya nakwa Pita, ‘O burula unu ụzọ gawa Galili. Ebe ahụ ka unu ga-ahụ ya dị ka ọ gwararịị unu.’ ”
8Ha gbapụtara site nʼili ahụ, nʼọnọdụ mgbagwoju anya na ahụ ịma jijiji. Ha akọrọghị onye ọbụla ihe ọbụla, nʼihi na egwu jupụtara ha obi.