11Mgbe ọbụla kwa ndị mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ha hụrụ ya, ha na-ada nʼala nʼihu ya na-eti mkpu na-asị, “Ị bụ Ọkpara Chineke!”
12Ma ọ na-enyesi ha iwu ike ka ha hapụ ịkọwa onye ọ bụ.
13Ọ rigooro nʼelu ugwu ma kpọrọ ndị ọ chọrọ nye onwe ya. Ha bịakwutekwara ya.
14Ọ họpụtara mmadụ iri na abụọ ndị ya na ha ga-anọ, mee ha ndị ozi. Ndị ọ ga-ezipụ ikwusa oziọma,
15nakwa ndị ga-enwe ikike ịchụpụ mmụọ ọjọọ.