26O wutere eze nke ukwuu, ma nʼihi iyi ọ ṅụrụ, na nʼihi ndị ọ kpọrọ oriri, ọ chọghị ịjụ inye ya ihe ọ rịọrọ ya.
27Ngwangwa o zipụrụ onye agha na-eche nche nye ya iwu ka ọ gaa bute isi Jọn. Ọ gara, bipụ isi Jọn nʼụlọ mkpọrọ,
28tinye isi ahụ nʼime efere butere nwaagbọghọ ahụ onye nara ya bunye nne ya.
29Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ nke a, ha bịara buru ozu ya gaa lie.
30Ndị ozi Jisọs gbara ya gburugburu kọọrọ ya ihe niile ha mere, na ihe niile ha kuziri.