Mak 6

Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ nke a, ha bịara buru ozu ya gaa lie.

Mark 6:29 (UKJV) And when his disciples heard of it, they came and took up his corpse, and laid it in a tomb.

27Ngwangwa o zipụrụ onye agha na-eche nche nye ya iwu ka ọ gaa bute isi Jọn. Ọ gara, bipụ isi Jọn nʼụlọ mkpọrọ,

28tinye isi ahụ nʼime efere butere nwaagbọghọ ahụ onye nara ya bunye nne ya.

29Mgbe ndị na-eso ụzọ ya nụrụ nke a, ha bịara buru ozu ya gaa lie.

30Ndị ozi Jisọs gbara ya gburugburu kọọrọ ya ihe niile ha mere, na ihe niile ha kuziri.

31Nʼoge ahụ, nʼihi na ọtụtụ ndị mmadụ na-abịa na-apụkwa nke mere na ha enweghị ohere iri nri, ọ sịrị ha, “Soronụ m, unu niile, ka anyị ga ebe dị jụụ, zuo ike nwa oge nta.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.