Mak 6

Mgbe ahụ o nyere ha iwu ka ha mee igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nʼotu nʼotu nʼelu ahịhịa ndụ.

Mark 6:39 (UKJV) And he commanded them to make all sit down by companies upon the green grass.

37Ma ọ zara sị ha, “Nyenụ ha ihe ha ga-eri.” Ha sịrị ya, “Anyị ga-eje ịzụta ogbe achịcha nke narị denarị abụọ, iji nye ha ka ha rie?”

38Ma ọ jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka unu nwere? Gaanụ chọpụta.” Mgbe ha chọpụtasịrị, ha sịrị, “Ogbe achịcha ise na azụ abụọ.”

39Mgbe ahụ o nyere ha iwu ka ha mee igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nʼotu nʼotu nʼelu ahịhịa ndụ.

40Ya mere, ha nọdụrụ ala, iri mmadụ ise nʼotu ebe, narị mmadụ nʼebe ọzọ.

41Ọ naara ogbe achịcha ise na azụ abụọ ndị ahụ, welie anya ya elu, nye ekele. Ọ nyawara achịcha ahụ nye ya ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ndị mmadụ ahụ. Otu aka ahụkwa ọ nyawakwara azụ abụọ ahụ nyekwa ha niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.