35Nʼoge a, ọchịchịrị ebidola ịgba, nʼihi ya, ndị na-eso ụzọ ya bịara gwa ya, “Ebe a bụ ọzara, chi ejiekwala.
36Zilaga ndị a, ka ha gaa nʼobodo nta ndị dị gburugburu ebe a, zụtara onwe ha ihe ha ga-eri.”
37Ma ọ zara sị ha, “Nyenụ ha ihe ha ga-eri.” Ha sịrị ya, “Anyị ga-eje ịzụta ogbe achịcha nke narị denarị abụọ, iji nye ha ka ha rie?”
38Ma ọ jụrụ ha sị, “Ogbe achịcha ole ka unu nwere? Gaanụ chọpụta.” Mgbe ha chọpụtasịrị, ha sịrị, “Ogbe achịcha ise na azụ abụọ.”
39Mgbe ahụ o nyere ha iwu ka ha mee igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nʼotu nʼotu nʼelu ahịhịa ndụ.