46Mgbe ndị a niile lachara, ọ rigooro nʼelu ugwu ikpe ekpere.
47Mgbe uhuruchi bịara, ụgbọ mmiri ahụ nọ nʼetiti osimiri, ma naanị ya onwe ya nọ nʼelu ala.
48Mgbe ọ hụrụ na ha nọ na nsogbu nʼihi na ikuku na-emegide ha, nʼihe dị ka elekere atọ nke ụtụtụ, o bidoro ịga ije nʼelu mmiri ịbịakwute ha, ma o mere dị ka ọ chọrọ ịgafe ha.
49Ma mgbe ha hụrụ ya ka ọ na-aga ije nʼelu osimiri, ha chere na ọ bụ mmụọ, tie mkpu akwa.
50Nʼihi na ha niile hụrụ ya, oke ụjọ tụkwara ha. Na-atụfughị oge, ọ gwara ha sị, “Nweenụ obi ike! Ọ bụ m. Unu atụla egwu.”