44Ọnụọgụgụ ndị nwoke riri ogbe achịcha ahụ dị puku mmadụ ise.
45Ngwangwa, o mere ka ndị na-eso ụzọ ya banye nʼụgbọ mmiri buru ya ụzọ gafee nʼofe nke ọzọ nke osimiri Betsaida, ebe ya onwe ya nọdụrụ izilaga igwe mmadụ ahụ.
46Mgbe ndị a niile lachara, ọ rigooro nʼelu ugwu ikpe ekpere.
47Mgbe uhuruchi bịara, ụgbọ mmiri ahụ nọ nʼetiti osimiri, ma naanị ya onwe ya nọ nʼelu ala.
48Mgbe ọ hụrụ na ha nọ na nsogbu nʼihi na ikuku na-emegide ha, nʼihe dị ka elekere atọ nke ụtụtụ, o bidoro ịga ije nʼelu mmiri ịbịakwute ha, ma o mere dị ka ọ chọrọ ịgafe ha.