53Mgbe ha gafere nʼofe nke ọzọ, ha rutere nʼala Genesaret ebe ha kedoro ụgbọ ha.
54Ma ngwangwa ha pụtara nʼụgbọ, ndị nọ nʼebe ahụ matara onye ọ bụ.
55Ha gbaara ọsọ gaa nʼobodo nta niile dị ebe ahụ gburugburu butere ya ndị ọrịa nʼute ebe ọbụla ha nụrụ na ọ nọ.
56Ebe ọbụla ọ bara, nʼobodo ukwu maọbụ na obodo nta, maọbụ nʼubi, ndị mmadụ na-ebute ndị ọrịa nibe ha nʼahịa. Ha rịọrọ ya ka o kwere ka ha metụ ọ bụladị ọnụnụ uwe ya aka; ndị niile metụrụ ya aka nwetara ọgwụgwọ.