51Emesịa, ọ rịgokwuru ha nʼime ụgbọ mmiri ahụ, otu mgbe ahụ ikuku ahụ dara juu. Ihe ndị a jukwara ha anya nke ukwuu.
52Obi ha mechiri emechi nʼihi na ha aghọtaghị ihe banyere ọrụ ebube ogbe achịcha ndị ahụ.
53Mgbe ha gafere nʼofe nke ọzọ, ha rutere nʼala Genesaret ebe ha kedoro ụgbọ ha.
54Ma ngwangwa ha pụtara nʼụgbọ, ndị nọ nʼebe ahụ matara onye ọ bụ.
55Ha gbaara ọsọ gaa nʼobodo nta niile dị ebe ahụ gburugburu butere ya ndị ọrịa nʼute ebe ọbụla ha nụrụ na ọ nọ.