23Ihe ọjọọ ndị a niile na-esite nʼime mmadụ a pụta. Ha bụkwa ihe na-emerụ mmadụ.”
24Ọ hapụrụ ebe ahụ gaa nʼakụkụ obodo Taịa. Nʼebe ahụ ọ banyere nʼime otu ụlọ. Ma o nwekwaghị ike izo onwe ya, nʼagbanyeghị na ọ chọghị ka a mata na ọ nọ ebe ahụ.
25Ngwangwa, otu nwanyị nwere otu nwa nwanyị ntakịrị nke mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya nụrụ maka ya, ọ bịara daa nʼụkwụ ya.
26Nwanyị a bụ onye Griik a mụrụ nʼakụkụ Sairo-Fonisia. Ọ rịọrọ ya ka ọ chụpụrụ ya mmụọ ọjọọ ahụ bi nʼime nwa ya nwanyị.
27Ọ sịrị ya, “Hapụ ka ụmụntakịrị buru ụzọ rie ihe, nʼihi na o zighị ezi na a ga-ewere nri ụmụntakịrị tụpụrụ nkịta.”