Mak 7

Ngwangwa, ntị ya meghere, a tọpụkwara ire ya, ọ malite ikwu okwu nke ọma.

Mark 7:35 (UKJV) And immediately his ears were opened, and the string of his tongue was loosed, and he spoke plain.

33O duuru ya pụọ nʼebe igwe mmadụ ahụ nọ, rụnye ya mkpịsịaka nʼime ntị ya abụọ. Mgbe ahụ ọ gbụpụkwara ọnụ mmiri metụkwa ya aka nʼire.

34O leliri anya nʼeluigwe sụọ ude sị ya, “Ef fata,” nke pụtara “Meghee!”

35Ngwangwa, ntị ya meghere, a tọpụkwara ire ya, ọ malite ikwu okwu nke ọma.

36Jisọs nyere ha iwu ka ha ghara ịgwa onye ọbụla, ma mgbe ọ na-eme nke a ha gara nʼihu na-akọsa ya ebe niile.

37Ọ tụrụ ha nʼanya nke ukwuu, ha kwuo sị, “O meela ihe niile nke ọma. Ọ na-eme ka ọ bụladị ndị ntị chiri nụ ihe, ma mee ka ndị ogbi kwuo okwu.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.