32Ha duteere ya otu nwoke ntị chịrị, nke na-asụkwa oke nsụ. Ha rịọrọ ya ka o bikwasị ya aka.
33O duuru ya pụọ nʼebe igwe mmadụ ahụ nọ, rụnye ya mkpịsịaka nʼime ntị ya abụọ. Mgbe ahụ ọ gbụpụkwara ọnụ mmiri metụkwa ya aka nʼire.
34O leliri anya nʼeluigwe sụọ ude sị ya, “Ef fata,” nke pụtara “Meghee!”
35Ngwangwa, ntị ya meghere, a tọpụkwara ire ya, ọ malite ikwu okwu nke ọma.
36Jisọs nyere ha iwu ka ha ghara ịgwa onye ọbụla, ma mgbe ọ na-eme nke a ha gara nʼihu na-akọsa ya ebe niile.