23Ọ duuru onye ìsì ahụ nʼaka pụọ nʼazụ obodo. Mgbe ahụ, ọ gbụsara ọnụ mmiri nʼanya ya metụkwa ya aka nʼanya. Ọ jụrụ ya sị, “Ị na-ahụ ihe ọbụla?”
24Nwoke ahụ leliri anya elu ma sị, “Ana m ahụ ndị mmadụ ma ha dị ka osisi na-agagharị agagharị.”
25Nke ugboro abụọ Jisọs metụkwara ya aka nʼanya, mgbe ahụ anya ya meghere. O bidoro ịhụ ihe niile nke ọma.
26Ọ zilagara ya ụlọ ya sị ya, “Abanyekwala nʼime obodo.”
27Mgbe ahụ Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya gara nʼobodo nta ndị ọzọ dị gburugburu Sizaria Filipai. Mgbe ha na-aga nʼụzọ, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Onye ka ndị mmadụ na-asị na m bụ?”