7Mgbe ahụ, igwe ojii pụtara kpuchie ha. Olu sitere nʼigwe ojii ahụ daa sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nʼanya. Geenụ ya ntị.”
8Na mberede, mgbe ha lere anya gburugburu, ọ dịkwaghị onye ọzọ ha hụrụ, karịa naanị Jisọs.
9Mgbe ha si nʼelu ugwu ahụ na-arịdata, Jisọs nyere ha iwu ka ha ghara ịgwa onye ọbụla ihe ha hụrụ, tutu ruo mgbe Nwa nke Mmadụ ga-esi nʼọnwụ bilie.
10Ha zobere ihe a nʼetiti onwe ha, na-ekwurịtara okwu na-atule ihe isi nʼọnwụ bilie pụtara.
11Ma ha jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị ozizi iwu jiri sị na Ịlaịja aghaghị ibu ụzọ bịa?”