Mak 9

Ma ha jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị ozizi iwu jiri sị na Ịlaịja aghaghị ibu ụzọ bịa?”

Mark 9:11 (UKJV) And they asked him, saying, Why say the scribes that Elijah must first come?

9Mgbe ha si nʼelu ugwu ahụ na-arịdata, Jisọs nyere ha iwu ka ha ghara ịgwa onye ọbụla ihe ha hụrụ, tutu ruo mgbe Nwa nke Mmadụ ga-esi nʼọnwụ bilie.

10Ha zobere ihe a nʼetiti onwe ha, na-ekwurịtara okwu na-atule ihe isi nʼọnwụ bilie pụtara.

11Ma ha jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị ozizi iwu jiri sị na Ịlaịja aghaghị ibu ụzọ bịa?”

12Ọ gwara ha sị, “Ọ bụ ezie, Ịlaịja ga-ebu ụzọ bịa, na-emekwa ka ihe dị ka ọ dị na mbụ. Ma gịnị mere e jiri dee na Nwa nke Mmadụ ga-ahụ ọtụtụ ahụhụ, bụrụkwa onye a jụrụ ajụ?

13Ka m gwa unu, Ịlaịja abịalarị. Ma ha mesokwara ya mmeso otu ha chọrọ dị ka e dere banyere ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.