34“Unu echekwala na m bịara iweta udo nʼụwa. Abịaghị m iweta udo, kama ọ bụ iwebata mma agha.
35Abịara m ime, “ ‘Ka nwoke megide nna ya, ka nwa nwanyị megide nne ya, ka nwunye nwa megide nne di ya,
36ndị iro mmadụ ga-abụ ndị ezinaụlọ ya.’
37“Ọ bụrụ na ị hụrụ nne gị maọbụ nna gị nʼanya karịa m, i kwesighị ịbụ onye nke m. Ọ bụrụ na ị hụrụ nwa gị nwoke, maọbụ nwa gị nwanyị nʼanya karịa m, i kwesighị ịbụ onye nke m.
38Onye ọbụla na-eburughị obe ya soro m, ekwesighị ị bụ onye nke m.