Matiu 11

E, Nna m, ọ tọrọ gị ụtọ ime ya nʼụzọ dị otu a.

Matthew 11:26 (UKJV) Even so, Father: for so it seemed good in your sight.

24Nʼezie asị m unu, ọ ga-adịrị unu njọ nʼụbọchị ikpe ahụ karịa obodo Sọdọm.”

25Nʼoge ahụ, Jisọs kwuru sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m ekele gị, nʼihi na ị zonarịrị ndị ọkachamara eziokwu ahụ, ma kpughee ya nye ụmụntakịrị.

26E, Nna m, ọ tọrọ gị ụtọ ime ya nʼụzọ dị otu a.

27“Nna m enyefeela m ihe niile nʼaka. Ọ dịghị onye maara Ọkpara ahụ ma ọ bụghị Nna ya. Ọ dịkwaghị onye maara Nna karịa Ọkpara ahụ na ndị Ọkpara ahụ kwadoro igosi Nna ya.

28“Bịakwutenụ m unu niile ndị na-adọgbu onwe unu nʼọrụ, ndị e bokwasịrị ibu dị arọ. Aga m enyekwa unu izuike.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.