23Ma gị Kapanọm bụ obodo a na-asọpụrụ, a ga-ebuli gị elu ruo eluigwe? Mba, ị ga-arịdaru ọkụ ala mmụọ. Nʼihi na a sị na a rụrụ ọrụ ebube m rụrụ nʼime gị nʼobodo Sọdọm, a garaghị ala ya nʼiyi. Ọ gaara adịrị ruo taa.
24Nʼezie asị m unu, ọ ga-adịrị unu njọ nʼụbọchị ikpe ahụ karịa obodo Sọdọm.”
25Nʼoge ahụ, Jisọs kwuru sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m ekele gị, nʼihi na ị zonarịrị ndị ọkachamara eziokwu ahụ, ma kpughee ya nye ụmụntakịrị.
26E, Nna m, ọ tọrọ gị ụtọ ime ya nʼụzọ dị otu a.
27“Nna m enyefeela m ihe niile nʼaka. Ọ dịghị onye maara Ọkpara ahụ ma ọ bụghị Nna ya. Ọ dịkwaghị onye maara Nna karịa Ọkpara ahụ na ndị Ọkpara ahụ kwadoro igosi Nna ya.