1Mgbe Jisọs nyesịrị ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ ndị a, ọ hapụrụ ebe ahụ pụọ. Bido na-ejegharị nʼobodo dị iche iche na-ezisa oziọma.
2Jọn omee baptizim nọkwa nʼụlọ mkpọrọ nʼoge ahụ. Mgbe ọ nụrụ akụkọ ọrụ ebube niile nke Kraịst na-arụ, o zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya.
3Ọ gwara ha ka ha jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ gị bụ onye ahụ anyị na-ele anya ọbịbịa ya, ka ọ bụ onye ọzọ?”
4Jisọs zara ha sị, “Laghachinụ azụ gwa Jọn banyere ihe unu nụrụ na ihe anya unu hụrụ.
5Gwanụ ya na a na-eme ka ndị ìsì hụ ụzọ, ka ndị ngwụrọ gaa ije. A na-emekwa ka ahụ ndị ekpenta dị ọcha. Ndị ogbi na-anụ ihe, na-ekwu okwu. Ndị nwụrụ anwụ ka a na-akpọte. Gwakwanụ ya ihe banyere oziọma a na-ezisara ndị ogbenye.