13Mgbe ahụ ọ sịrị nwoke ahụ, “Setịpụ aka gị.” Nwoke ahụ setịpụrụ aka ya. Aka ahụ dịkwara ya mma dị ka aka nke ọzọ.
14Nʼihi nke a ndị Farisii sitere nʼebe ahụ pụọ, ga gbaa izu otu ha ga-esi gbuo ya.
15Ma ebe Jisọs maara ihe ha na-ezube ime, o sitere nʼebe ahụ pụọ. Ma ọtụtụ ndị mmadụ sooro ya. Ọ gwọkwara ha nrịa nrịa ha niile.
16Ma o nyere ha iwu ka ha hapụ ịgwa ndị ọzọ onye ọ bụ.
17Nke a bụ ka emezuo okwu ahụ Aịzaya onye amụma kwuru,