Matiu 12

Ma o nyere ha iwu ka ha hapụ ịgwa ndị ọzọ onye ọ bụ.

Matthew 12:16 (UKJV) And charged them that they should not make him known:

14Nʼihi nke a ndị Farisii sitere nʼebe ahụ pụọ, ga gbaa izu otu ha ga-esi gbuo ya.

15Ma ebe Jisọs maara ihe ha na-ezube ime, o sitere nʼebe ahụ pụọ. Ma ọtụtụ ndị mmadụ sooro ya. Ọ gwọkwara ha nrịa nrịa ha niile.

16Ma o nyere ha iwu ka ha hapụ ịgwa ndị ọzọ onye ọ bụ.

17Nke a bụ ka emezuo okwu ahụ Aịzaya onye amụma kwuru,

18“Onye a bụ onye na-ejere m ozi, onye m họpụtara. Onye m hụkwara nʼanya. O bụkwa onye ihe ya na-atọ m ụtọ. Aga m etinye Mmụọ m nʼime ya. Ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi rute mba niile aka.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.