29“Ọ dịghị mmadụ ọbụla pụrụ ịbanye nʼụlọ nwoke dị ike kwakọrọ ngwongwo niile dị nʼụlọ ahụ. Ma o nwere ike ime nke a ma ọ bụrụ na ọ ga-eburu ụzọ kee nwoke ahụ agbụ? Mgbe o kesịrị ya agbụ, o nwere ike ịbanye kwakọtaa ngwongwo niile dị nʼụlọ nwoke ahụ.
30“Onye ọbụla na-adịnyeghịrị m na-emegide m. Onye ọ bụlakwa na-adịghị eso m ekpokọta, na-ekposa ekposa.
31Ya mere, ana m agwa unu sị, na a ga-agbaghara mmehie na nkwulu niile. Ma agaghị agbaghara nkwulu ekwuluru Mmụọ Nsọ.
32Onye ọbụla nke ga-ekwu okwu megide Nwa nke Mmadụ, a ga-agbaghara ya, ma onye ọbụla na-ekwu megide Mmụọ Nsọ, agaghị agbaghara ya, nʼọgbọ a maọbụ nʼọgbọ nke na-abịa.
33“Ọ bụrụ na e mee ka osisi too nke ọma, ọ ga-amịta mkpụrụ ọma, ma ọ bụrụ na o toghị nke ọma, ọ ga-amịta mkpụrụ ọjọọ. Nʼihi na a na-amata osisi ọbụla site na mkpụrụ ya.