20Mkpụrụ nke dara nʼala nkume nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ oziọma ahụ, jirikwa oke ọṅụ nabata ya.
21Ma ebe ha na-enweghị mgbọrọgwụ nʼime ha. Ha na-anọ nwa oge nta. Mgbe nsogbu maọbụ mkpagbu bịara nʼihi okwu ahụ, ngwangwa ha na-adachapụ.
22Mkpụrụ nke dara nʼala ahụ ogwu ogwu dị nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ oziọma ahụ, ma ọchịchọ nke ụwa a, ya na itinye obi nʼakụ nke ụwa a, kpagidere okwu dị nʼime ya, mee ka ọ ghara ịmị mkpụrụ.
23Ma mkpụrụ dara nʼala ọma ahụ nọchiri anya obi mmadụ onye gere ntị nʼoziọma ahụ, ghọtakwa ya. Ọ na-amịta mkpụrụ dị narị, maọbụ iri isii, maọbụ iri atọ karịa ihe akụnyere nʼime ya.”
24Ọ tụụrụ ha ilu ọzọ sị, “Alaeze eluigwe dị ka mmadụ ọbụla nke kụrụ ezi mkpụrụ nʼubi ya.