Matiu 13

Ma mkpụrụ dara nʼala ọma ahụ nọchiri anya obi mmadụ onye gere ntị nʼoziọma ahụ, ghọtakwa ya. Ọ na-amịta mkpụrụ dị narị, maọbụ iri isii, maọbụ iri atọ karịa ihe akụnyere nʼime ya.”

Matthew 13:23 (UKJV) But he that received seed into the good ground is he that hears the word, and understands it; which also bears fruit, and brings forth, some an hundredfold, some sixty, some thirty.

21Ma ebe ha na-enweghị mgbọrọgwụ nʼime ha. Ha na-anọ nwa oge nta. Mgbe nsogbu maọbụ mkpagbu bịara nʼihi okwu ahụ, ngwangwa ha na-adachapụ.

22Mkpụrụ nke dara nʼala ahụ ogwu ogwu dị nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ oziọma ahụ, ma ọchịchọ nke ụwa a, ya na itinye obi nʼakụ nke ụwa a, kpagidere okwu dị nʼime ya, mee ka ọ ghara ịmị mkpụrụ.

23Ma mkpụrụ dara nʼala ọma ahụ nọchiri anya obi mmadụ onye gere ntị nʼoziọma ahụ, ghọtakwa ya. Ọ na-amịta mkpụrụ dị narị, maọbụ iri isii, maọbụ iri atọ karịa ihe akụnyere nʼime ya.”

24Ọ tụụrụ ha ilu ọzọ sị, “Alaeze eluigwe dị ka mmadụ ọbụla nke kụrụ ezi mkpụrụ nʼubi ya.

25Ma nʼotu abalị, mgbe onye ọbụla nọ nʼụra, onye iro gara nʼubi ahụ kụọ mkpụrụ na-epu ahịhịa nʼetiti ezi mkpụrụ ọka wiiti ahụ ọ kụrụ ma laa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.