Matiu 13

Ma nʼotu abalị, mgbe onye ọbụla nọ nʼụra, onye iro gara nʼubi ahụ kụọ mkpụrụ na-epu ahịhịa nʼetiti ezi mkpụrụ ọka wiiti ahụ ọ kụrụ ma laa.

Matthew 13:25 (UKJV) But while men slept, his enemy came and sowed tares among the wheat, and went his way.

23Ma mkpụrụ dara nʼala ọma ahụ nọchiri anya obi mmadụ onye gere ntị nʼoziọma ahụ, ghọtakwa ya. Ọ na-amịta mkpụrụ dị narị, maọbụ iri isii, maọbụ iri atọ karịa ihe akụnyere nʼime ya.”

24Ọ tụụrụ ha ilu ọzọ sị, “Alaeze eluigwe dị ka mmadụ ọbụla nke kụrụ ezi mkpụrụ nʼubi ya.

25Ma nʼotu abalị, mgbe onye ọbụla nọ nʼụra, onye iro gara nʼubi ahụ kụọ mkpụrụ na-epu ahịhịa nʼetiti ezi mkpụrụ ọka wiiti ahụ ọ kụrụ ma laa.

26Mgbe mkpụrụ ọka wiiti ndị ahụ puputara, mepụta isi ọka, ahịhịa ahụ bidokwara ito.

27“Ndị ọrụ onye nwe ubi ahụ bịara sị ya, ‘Nna anyị ukwu, ọ bụghị ezi mkpụrụ ọka ka ị kụrụ nʼubi gị? Ebeekwanụ ka ahịhịa ndị a si bịa?’

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.