Matiu 13

Ọ tụkwara ilu ọzọ sị ha, “Alaeze eluigwe dị ka mkpụrụ mọstaadị nke onye ọrụ ubi kụrụ nʼubi ya.

Matthew 13:31 (UKJV) Another parable put he forth unto them, saying, The kingdom of heaven is like to a grain of mustard seed, which a man took, and sowed in his field:

29“Ma onye ọrụ ubi ahụ sịrị ha, ‘Ọ dịghị, nʼihi na mgbe unu na-achọ ihopu ahịhịa ndị ahụ, unu nwere ike site na-amaghị ama hopu ezi mkpụrụ ọka wiiti.

30Hapụnụ ọka ahụ ka ha na ahịhịa ndị ahụ na-etokọta, tutu ruo mgbe a ga-ewe ihe ubi. Nʼoge ahụ aga m enye ndị owuwe ihe ubi iwu sị, burunu ụzọ chịkọtasịa ahịhịa ndị a niile, kee ha nʼukwu nʼukwu, kpọọ ha ọkụ. Ma kpokọtanụ ọka wiiti ndị a tinye ha nʼọba m.’ ”

31Ọ tụkwara ilu ọzọ sị ha, “Alaeze eluigwe dị ka mkpụrụ mọstaadị nke onye ọrụ ubi kụrụ nʼubi ya.

32Ọ bụ ezie na ọ bụ mkpụrụ dịkarịsịrị nta karịa mkpụrụ ubi niile, ma mgbe mkpụrụ a toro, ọ na-adị ukwuu karịa ihe niile a kụrụ nʼubi. Ọ na-aghọ osisi buru ibu, nke ụmụ nnụnụ na-ezukwa ike nʼalaka ya.”

33Ọ tụrụ ha ilu ọzọ sị, “Alaeze eluigwe dị ka ihe na-eko achịcha, nke nwanyị na-ewere gwakọta nʼụtụ ọka e ji eme achịcha, tutu ruo mgbe ihe iko achịcha ahụ mere ka ụtụ ọka ahụ niile koo.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.