30Hapụnụ ọka ahụ ka ha na ahịhịa ndị ahụ na-etokọta, tutu ruo mgbe a ga-ewe ihe ubi. Nʼoge ahụ aga m enye ndị owuwe ihe ubi iwu sị, burunu ụzọ chịkọtasịa ahịhịa ndị a niile, kee ha nʼukwu nʼukwu, kpọọ ha ọkụ. Ma kpokọtanụ ọka wiiti ndị a tinye ha nʼọba m.’ ”
31Ọ tụkwara ilu ọzọ sị ha, “Alaeze eluigwe dị ka mkpụrụ mọstaadị nke onye ọrụ ubi kụrụ nʼubi ya.
32Ọ bụ ezie na ọ bụ mkpụrụ dịkarịsịrị nta karịa mkpụrụ ubi niile, ma mgbe mkpụrụ a toro, ọ na-adị ukwuu karịa ihe niile a kụrụ nʼubi. Ọ na-aghọ osisi buru ibu, nke ụmụ nnụnụ na-ezukwa ike nʼalaka ya.”
33Ọ tụrụ ha ilu ọzọ sị, “Alaeze eluigwe dị ka ihe na-eko achịcha, nke nwanyị na-ewere gwakọta nʼụtụ ọka e ji eme achịcha, tutu ruo mgbe ihe iko achịcha ahụ mere ka ụtụ ọka ahụ niile koo.”
34Oge niile ka Jisọs na-eji ilu na-agwa ndị mmadụ ndị a okwu. O nweghị oge ọbụla ọ gwara ha okwu hapụ iji ilu.