35O mere nke a ka okwu onye amụma kwuru mezuo, sị, “Aga m eji ilu kwuo okwu mgbe m na-agwa ha okwu. Aga m agwakwa ha ihe mmadụ ọbụla na-amaghị site nʼoge e kere ụwa.”
36Emesịa, ọ hapụrụ igwe mmadụ ahụ baa nʼụlọ. Ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Kọwaara anyị ihe ilu ahụ ị tụrụ pụtara, ilu banyere ahịhịa puru nʼubi a kụrụ ọka.”
37Jisọs zara ha sị, “Nwoke ahụ kụrụ mkpụrụ ahụ bụ Nwa nke Mmadụ.
38Ubi ahụ a ghanyere mkpụrụ ndị ahụ bụ ụwa. Mkpụrụ nke a kụrụ nʼubi ahụ nọchiri anya ụmụ nke alaeze ahụ. Ahịhịa ahụ puru nʼubi ahụ nọchikwara anya ụmụ ajọ onye ahụ.
39Onye iro ahụ gara kụọ mkpụrụ puru ahịhịa bụ ekwensu. Owuwe ihe ubi nọchiri anya ọgwụgwụ oge. Ndị owuwe ihe ubi bụkwa ndị mmụọ ozi.