40“Dị ka e siri fopụtasịa ahịhịa ahụ kpọọ ha ọkụ, otu a ka ọ ga-adị mgbe ụwa ga-agwụ.
41Nwa nke Mmadụ ga-ezipụ ndị mmụọ ozi ya ka ha gaa site nʼalaeze ya fopụtasịa ihe niile na-eme ka e mee mmehie, na ndị niile na-eme ajọ ihe.
42Ha ga-atụbakwa ha nʼime oke ọkụ ahụ, ebe ha ga-anọ na-akwa akwa, na-atakwa ikikere eze.
43Ma ndị niile bụ ndị ezi omume ga-enwu dị ka anyanwụ nʼime alaeze Nna ha. Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.
44“Alaeze eluigwe dị ka akụ e zoro nʼubi, nke otu nwoke chọpụtara zookwa ya ọzọ. Nwoke a jiri ọṅụ ree ihe niile o nwere, ma gaa zụta ubi ahụ.