42Ha ga-atụbakwa ha nʼime oke ọkụ ahụ, ebe ha ga-anọ na-akwa akwa, na-atakwa ikikere eze.
43Ma ndị niile bụ ndị ezi omume ga-enwu dị ka anyanwụ nʼime alaeze Nna ha. Onye ọbụla nwere ntị ịnụ ihe, ya nụrụ.
44“Alaeze eluigwe dị ka akụ e zoro nʼubi, nke otu nwoke chọpụtara zookwa ya ọzọ. Nwoke a jiri ọṅụ ree ihe niile o nwere, ma gaa zụta ubi ahụ.
45“Ọzọ, alaeze eluigwe yiri nkume dị oke ọnụahịa nke onye na-azụ ahịa chọtara.
46Mgbe ọ hụrụ nkume a, o ree ihe niile o nwere, were ego ya gaa zụrụ nkume a dị oke ọnụahịa.