48Mgbe ụgbụ a juru, ndị ọkụ azụ ahụ na-adọpụta ya. Nọdụ ala họpụtasịa ndị dị mma tinye ha nʼime nkata, ma tufuo ndị na-adịghị mma.
49Otu a ka ọ ga-adị nʼọgwụgwụ oge. Ndị mmụọ ozi ga-abịa kewapụ ndị ọjọọ site nʼetiti ndị ezi omume,
50ma tụbakwa ha nʼime oke ọkụ ahụ. Ebe ha ga-anọ na-akwa akwa na-atakwa ikikere eze.”
51Ọ jụrụ ha sị, “Unu ghọtara ihe ndị a m na-ekwu?” Ha zara sị ya, “E.”
52Ọ sịrị ha, “Nʼihi nke a, onye nkuzi nke iwu ọbụla nke e mere ka ọ bụrụ onye na-eso ụzọ alaeze eluigwe, dị ka onyenwe ụlọ nke na-esite nʼụlọakụ ya na-ewepụta ihe ọhụrụ na ihe ochie.”