52Ọ sịrị ha, “Nʼihi nke a, onye nkuzi nke iwu ọbụla nke e mere ka ọ bụrụ onye na-eso ụzọ alaeze eluigwe, dị ka onyenwe ụlọ nke na-esite nʼụlọakụ ya na-ewepụta ihe ọhụrụ na ihe ochie.”
53Mgbe Jisọs tụsịrị ilu ndị a, o si ebe ahụ pụọ.
54O rutere nʼobodo ya, malite izi ha ihe nʼụlọ ekpere ha, nke a jukwara ha anya. Ha jụrịtara onwe ha ajụjụ na-asị, “Ebee ka o si nweta amamihe a? Ebee ka o si nweta ike ịrụ ọrụ ebube ndị a niile?
55Nwoke a, ọ bụghị nwa onye kapinta? Ọ bụ na-adịghị akpọ nne ya Meri? Jemis, Josef, Saimọn na Judas, ha abụghị ụmụnne ya ndị ikom?
56Ụmụnne ya ndị inyom niile, ha anọghị nʼetiti anyị? Olee ebekwa ka nwoke a si nweta ihe ndị a?”