30Ma mgbe ọ hụrụ oke ebili mmiri ahụ ka ọ na-amagharị; egwu tụrụ ya. Ma mgbe ọ malitere imikpu nʼime mmiri ahụ, o tiri mkpu sị, “Onyenwe m! Zọpụta m!”
31Na-atụfughị oge, Jisọs setịpụrụ aka ya dọpụta Pita. Ọ sịrị ya, “Gị onye okwukwe nta, nʼihi gịnị ka i ji nwee obi abụọ!”
32Ma mgbe ha rịbanyere nʼime ụgbọ ahụ ifufe ahụ kwụsịkwara.
33Ndị ahụ nọ nʼụgbọ ahụ kpọrọ isiala nye ya sị, “Nʼezie, ị bụ Ọkpara Chineke.”
34Mgbe ha gafere nʼofe nke ọzọ, ha bịarutere nʼala Genesaret.