Matiu 15

Jisọs zara sị ya, “Nwanyị, okwukwe gị dị ukwuu! Laa, e meelara gị ihe ị na-arịọ.” Nʼotu oge ahụ a gwọrọ ada ya.

Matthew 15:28 (UKJV) Then Jesus answered and said unto her, O woman, great is your faith: be it unto you even as you will. And her daughter was made whole from that very hour.

26Ọ zara sị, “O zighị ezi na a ga-ewere nri ụmụntakịrị tụpụrụ nkịta.”

27Ọ zara sị, “Ọ bụ eziokwu Onyenwe m. Ma a na-ekwekwa ka ụmụ nkịta nọ nʼokpuru tebul rie iberibe nri nke na-esi nʼelu tebul ha daa nʼala.”

28Jisọs zara sị ya, “Nwanyị, okwukwe gị dị ukwuu! Laa, e meelara gị ihe ị na-arịọ.” Nʼotu oge ahụ a gwọrọ ada ya.

29Jisọs hapụrụ ebe ahụ lọghachi nʼakụkụ osimiri Galili. Ọ rịgooro nʼelu ugwu nọdụ ala.

30Igwe mmadụ dị ukwuu bịakwutere ya. Ha duteere ya ndị ngwụrọ, na ndị ìsì, na ndị aka ha na ndị ụkwụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ, na ndị ogbi, na ọtụtụ ndị ọzọ. Ha tọgbọrọ ha nʼụkwụ ya, ọ gwọkwara ha niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.