21Ma mmụọ ọjọọ dị otu a agaghị apụ, ma ọ bụghị naanị site nʼikpe ekpere na ibu ọnụ.”
22Mgbe ha gbakọrọ na Galili, Jisọs gwara ha sị, “A ga-arara Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ndị mmadụ.
23Ha ga-egbukwa ya, ma nʼụbọchị nke atọ a ga-eme ka o si nʼọnwụ bilie.” Nke a wutere ha nke ukwuu.
24Mgbe ha bịaruru na Kapanọm, ndị na-ana ụtụ nʼihi ụlọnsọ bịakwutere Pita jụọ ya sị, “Onye ozizi unu ọ dịghị atụ ụtụ ụlọnsọ?”
25Pita zara ha sị, “E, ọ na-atụ ụtụ.” Mgbe ọ batara nʼụlọ, Jisọs buru ụzọ jụọ ya sị, “Gịnị ka i chere banyere nke a Saimọn? Ọ bụ nʼaka ndị ole ka ndị eze ụwa si anakọta ụtụ taks? Ọ bụ nʼaka ụmụ ha, ka ọ bụ nʼaka ndị ọbịa?”