23Ha ga-egbukwa ya, ma nʼụbọchị nke atọ a ga-eme ka o si nʼọnwụ bilie.” Nke a wutere ha nke ukwuu.
24Mgbe ha bịaruru na Kapanọm, ndị na-ana ụtụ nʼihi ụlọnsọ bịakwutere Pita jụọ ya sị, “Onye ozizi unu ọ dịghị atụ ụtụ ụlọnsọ?”
25Pita zara ha sị, “E, ọ na-atụ ụtụ.” Mgbe ọ batara nʼụlọ, Jisọs buru ụzọ jụọ ya sị, “Gịnị ka i chere banyere nke a Saimọn? Ọ bụ nʼaka ndị ole ka ndị eze ụwa si anakọta ụtụ taks? Ọ bụ nʼaka ụmụ ha, ka ọ bụ nʼaka ndị ọbịa?”
26Ma mgbe Pita zara ya sị, “Ọ bụ site nʼaka ndị ọbịa.” Jisọs sịrị ya, “Ọ dị mma. Iwu ejighị ndị bụ ụmụ.
27Ma otu ọ dị, achọghị m ka anyị mee ka iwe wee ha. Gaa nʼosimiri ahụ tụnye nko azụ gị nʼime ya. Meghe ọnụ azụ mbụ ị ga-egbute. Ị ga-ahụ otu mkpụrụ ego nʼime ọnụ ya. Were ya nye ha, ka ọ bụrụ ụtụ nke mụ na gị.”