1Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, o hapụrụ Galili gaa na mpaghara Judịa, nke dị nʼofe osimiri Jọdan.
2Igwe mmadụ dị ukwuu sooro ya. Ọ gwọkwara ndị ahụ na-esighị ike nʼetiti ha nʼebe ahụ.
3Ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere ya i nwalee ya, sị, “O ziri ezi nʼiwu na nwoke ga-agbara nwunye ya alụkwaghị m nʼihi ihe ọbụla?”