Matiu 19

Ma ọ zara sị ha, “Ọ bụghị mmadụ niile ga-anagide okwu a. Naanị ndị e nyere ike ime ya ga-anagide ya.

Matthew 19:11 (UKJV) But he said unto them, All men cannot receive this saying, save they to whom it is given.

9Ma ana m asị unu, onye ọbụla ga-ahapụ nwunye ya lụrụ onye ọzọ, ma ọ bụghị nʼihi na o jidere nwunye ya na mmehie ịkwa iko, onye ahụ emeela mmehie ịkwa iko ma ọ lụọ nwanyị ọzọ.”

10Ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ ka mma na mmadụ alụghị nwunye ma ọlị.”

11Ma ọ zara sị ha, “Ọ bụghị mmadụ niile ga-anagide okwu a. Naanị ndị e nyere ike ime ya ga-anagide ya.

12Ma ụfọdụ ndị mmadụ ka a mụrụ ka ha bụrụ onozi, ndị ọzọ bụkwa ndị mmadụ ibe ha mere otu a. Ndị ọzọ dịkwa ndị jiri aka ha họrọ ibu onozi nʼihi alaeze eluigwe. Onye pụrụ ịnara nke a, ya nara ya.”

13Mgbe ahụ e kuteere ya ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka, kpeekwara ha ekpere. Ma ndị na-eso ụzọ ya baara ndị kutere ha mba.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.