Matiu 19

Mgbe ahụ e kuteere ya ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka, kpeekwara ha ekpere. Ma ndị na-eso ụzọ ya baara ndị kutere ha mba.

Matthew 19:13 (UKJV) Then were there brought unto him little children, that he should put his hands on them, and pray: and the disciples rebuked them.

11Ma ọ zara sị ha, “Ọ bụghị mmadụ niile ga-anagide okwu a. Naanị ndị e nyere ike ime ya ga-anagide ya.

12Ma ụfọdụ ndị mmadụ ka a mụrụ ka ha bụrụ onozi, ndị ọzọ bụkwa ndị mmadụ ibe ha mere otu a. Ndị ọzọ dịkwa ndị jiri aka ha họrọ ibu onozi nʼihi alaeze eluigwe. Onye pụrụ ịnara nke a, ya nara ya.”

13Mgbe ahụ e kuteere ya ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka, kpeekwara ha ekpere. Ma ndị na-eso ụzọ ya baara ndị kutere ha mba.

14Ma Jisọs sịrị ha, “Kweenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m, unu egbochikwala ha. Nʼihi na alaeze eluigwe bụ nke ndị dị otu a.”

15O bikwasịrị ha aka nʼisi gọzie ha niile tupu ọ hapụ ha pụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.