2Igwe mmadụ dị ukwuu sooro ya. Ọ gwọkwara ndị ahụ na-esighị ike nʼetiti ha nʼebe ahụ.
3Ụfọdụ ndị Farisii bịakwutere ya i nwalee ya, sị, “O ziri ezi nʼiwu na nwoke ga-agbara nwunye ya alụkwaghị m nʼihi ihe ọbụla?”
4Ọ zara ha sị, “Ọ bụ na unu agụtabeghị na akwụkwọ nsọ, na Onye kere ha na mbụ kere ha nwoke na nwanyị.
5Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne ya na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. Ha abụọ ga-abụkwa otu anụ ahụ.
6Ya mere, ha abụkwaghị mmadụ abụọ ọzọ, kama otu anụ ahụ. Ya mere, ihe Chineke jikọtara, ka mmadụ ọbụla atọsala ya.”