1Mgbe a mụchara Jisọs na Betlehem nke Judịa nʼoge Herọd bụ eze, ndị amamihe si ọwụwa anyanwụ bịaruru Jerusalem,
2na-ajụ ajụjụ sị, “Olee ebe ọ nọ, bụ onye a mụrụ ịbụ eze ndị Juu? Anyị hụrụ kpakpando ya nʼọwụwa anyanwụ, ma bịa ịkpọ isiala nye ya.”
3Mgbe eze Herọd nụrụ nke a, obi lọrọ ya mmiri nke ukwuu, ya na ndị niile bi na Jerusalem.